Isaiah 18

Amụma e buru banyere Kush

1Ahụhụ ga-adịrị ala ahụ a na-anụ ụzụ ọtụtụ nku nʼime ya,
Maọbụ, ụzụ igurube

ala ahụ dị nʼofe iyi ukwu niile nke Kush.
Nʼoge Aịzaya onye amụma, ndị Kush nʼachị Ijipt. Mgbe ha chọrọ ibuso ndị Asịrịa agha, ha rịọrọ ndị Palestin ka ha nyere ha aka.

2Ala nke na-ezipụ ndị ozi ya site nʼosimiri,
bụ ndị na-eji ụgbọ mmiri papịrọs nʼaga nʼelu mmiri.

Gaanụ ngwangwa, unu ndị ozi dị nkọ
gakwuru ndị toro ogologo nke ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ,
gakwuru ndị a na-atụ egwu nʼebe niile,
mba na-achọ okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa,
ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.

3Unu niile bi nʼelu ụwa dum,
na unu ndị nwere ebe obibi nʼụwa, geenụ m ntị.
Mgbe e buliri ọkọlọtọ elu nʼelu ugwu niile,
lee anya;
mgbe a fụrụ opi ike,
gee ntị.
4Nʼihi na ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị gwara m,
“Aga m anọ jụụ na-elepụ anya site nʼebe obibi m,
dịka mgbe igirigi na-ada nʼoge okpomọkụ nke owuwe ihe ubi,
na dịka anyanwụ si acha nʼoge okpomọkụ.”
5Nʼihi na tupu oge owuwe ihe ubi eruo, mgbe ifuru dapụsịrị,
mgbe okoko na-aghọ mkpụrụ vaịnị nke ka na-achata achata,
ọ ga-eji mma oge gbuchapụ ụmụ alaka ya,
ọ ga-egbutu ma wezugakwa alaka ndị ahụ na-awasa awasa.
6A ga-ahapụ ozu ndị agha ha
ka anụ ufe nke ugwu na ụmụ anụ ọhịa rie ha.
Ụmụ nnụnụ ga-eri anụ ha nʼoge okpomọkụ,
ma ụmụ anụ ọhịa ga-eri ha nʼoge oyi.
7Ma mgbe ahụ, a ga-ewetara Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye dị iche iche,

site na ndị toro ogologo, ndị ahụ na-akwọ mụrụmụrụ,
site na ndị a na-atụ egwu nʼebe niile,
bụ mba ndị okwu na ụka,
Maọbụ, asụsụ dị iche
nke na-azọpịakwa azọpịa,
ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.
A ga-eweta onyinye a nʼUgwu Zayọn, nʼebe ahụ a na-akpọku aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

Copyright information for IboBIU